Job 11

Okwu Zofa

1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?
A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?
3Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?
Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?
4Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,
adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
5Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,
na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.
6Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,
nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.
Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

7“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?
I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
8Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?
Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?
9Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,
dị obosara karịa oke osimiri.

10“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,
kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?
11Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,
mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?
12Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe
naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.

13“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,
setịpụ aka gị abụọ nye ya,
14ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,
ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị
15mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,
ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.
16Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,
na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.
17Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,
ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.
18Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;
ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
19Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,
ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
20Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,
ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ;
olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”
Copyright information for IboBIU